Gịnị bụ ọkwa (tier) na oke P2P?
Onye ọ bụla na-eji Deriv P2P nwere ọkwa (tier). Ọkwa gị na-akọwa ego i nwere ike ịzụ na ire kwa ụbọchị. Ndị ọhụrụ na-amalite na Bronze, ị na-arịgo mgbe i wuliri aha ọma nke azụmahịa echekwabara, nke emechara.
Oke ndị a na-enyere aka ichekwa nchebe nke ahịa. Ndị ọkwa dị elu ka ndị egosiri na ha na-azụ ahịa n'ụzọ e kwesịrị ịtụkwasị obi.
- Ọkwa — Oke ịzụ kwa ụbọchị (USD) — Oke ire kwa ụbọchị (USD)
- Bronze — 500 — 500
- Silver — 5,000 — 5,000
- Gold — 8,000 — 8,000
- Diamond — 11,000 — 11,000
Etu oke ndị a si arụ ọrụ
- Oke ịzụ na oke ire dị iche iche. Na Bronze, i nwere ike ịzụ ihe ruru 500 USD na i wee ree ihe ruru 500 USD n'otu ụbọchị ahụ.
- Oke bụ nchikota azụmahịa gị niile n'ụbọchị ahụ, ọ bụghị nke oder ọ bụla. Dịka ọmụmaatụ, na Bronze, ọ bụrụ na ị zụrụla 300 USD taa, i nwere ike ịzụ ihe ruru 200 USD ọzọ.
- Oke na-amalitegharị kwa awa 24
- Oder ndị a kagburu maọbụ ndị oge ha gafere anaghị agụnye n'oke gị kwa ụbọchị
- Mgbasa ozi (ad) ọ bụla nwere ike inwe oke ntakịrị na oke ukwuu nke aka ya maka nha oder. Ị ga-aghaghị ịnọgide n'ime oke mgbasa ozi ahụ na n'ime oke gị kwa ụbọchị fọdụrụnụ.
Ebe ị ga-ahụ ọkwa gị
Ị nwere ike ịhụ ọkwa gị na peeji profaịlụ P2P gị
Iji mụta otu i si arịgo n'ọkwa dị elu, gụọ "Kedu ka m ga-esi ruo eru maka ọkwa Deriv P2P dị elu?"






