Akwụkwọ a bụ akụkụ nke nkwekọrịta dị n'etiti gị na Deriv, ekwesịkwara ịgụkọta ya na Usoro Ojiji Izugbe anyị maka ndị ahịa ("Usoro Izugbe"). Okwu ọ bụla a kọwara na usoro ndị a agbakwunyere ga-enwe otu nkọwa ahụ e nyere ya na Usoro Izugbe.
1. Ngụpụta
1.1. Usoro iwu ndị a na-emetụta ndị ahịa niile nwere akaụntụ na Deriv Investment Bank (Labuan) Ltd. (formerly known as Deriv (FX) Ltd., Company No. LL13394, Labuan Investment Bank Licence No. 260160BI).
1.2. Ọ bụrụ na e nwere adịghị kwekọ ma ọ bụ ọdịiche n'etiti usoro iwu ndị a na/ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ ọbụla bụ akụkụ nke Nkwekọrịta a, usoro iwu ndị a ga-adị mkpa karịa n'ihe gbasara akaụntụ gị na Deriv Investment Bank (Labuan) Ltd. (formerly known as Deriv (FX) Ltd.)
1.3. Deriv Investment Bank (Labuan) Ltd. (formerly known as Deriv (FX) Ltd.) nwere ikikere n'okpuru Labuan Financial Services and Securities Act 2010 ịrụ ọrụ ụlọ akụ itinye ego nke Labuan site na ma ọ bụ site n'ime Federal Territory nke Labuan, Malaysia, ma Labuan Financial Services Authority enyela ya ikikere ma na-achịkwa ya.
2. Imezu Iwu Azụmahịa
2.1. Dabere n'ọnọdụ ikike anyị, anyị na-arụ ọrụ dị ka onye nnọchite anya gị mgbe anyị na-emezu iwu azụmahịa gị, anyị abụghịkwa onye mmekọ gị n'azụmahịa.
2.2. Mgbe e nyere iwu ịzụta ma ọ bụ ire ngwa azụmahịa n'akaụntụ Deriv MT5 gị, a na-eziga iwu gị ahụ na liquidity provider nke na-enye anyị ọrụ. Anyị adịghị ewere ọnọdụ azụmahịa ọbụla n'azụmahịa gị.
2.3. Achọrọ ka anyị mee nyocha kwesịrị ekwesị (due diligence) n'ebe liquidity providers niile nọ, ma hụ na ebe azụmahịa anyị na-eji bụ nke ụlọ ọrụ nlekọta ma ọ bụ ọchịchị a ma ama na-achịkwa achịkwa ya.
3. Ozi Ọzọ
3.1. Maka ozi ndị ọzọ metụtara akaụntụ gị na Deriv Investment Bank (Labuan) Ltd. (formerly known as Deriv (FX) Ltd.), biko gaa na landing page a ("Landing Page"). A ga-enwe ike inye gị Landing Page n'oge ndebanye aha ma ọ bụ site na Platfọm. Ọdịnaya dị na Landing Page bụ naanị maka ozi, ọ gaghị emegharị Nkwekọrịta ahụ ma ọ bụrụ na e kwuru ya hoo haa n'ụzọ ọzọ.